Psalms 49

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.

Nzuzu ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba

1Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile!
Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa,
2ma ndị dị ala ma ndị dị elu,
E nwekwara ike gụọ ya otu a, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ nwoke.

ma onye ọgaranya ma onye ogbenye.
3Aga m ekwu okwu amamihe,
ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.
4Aga m aṅa ntị nye ilu,
aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m.

5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara,
mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,
6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha
ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha.
7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ,
maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ,
8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ,
o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu, b
9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi,
ma hapụ ịnwụ.
10Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ,
ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa,
si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.
11Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi,
ebe obibi ha ruo ọgbọ niile
nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha.

12Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ,
dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa.

13Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha,
na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela
14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,
ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,
ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.
Ozu ha ga-erekasị nʼime ili
nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha.
15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela
16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,
mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,
ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,
ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya
ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.

20Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta
dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.
Copyright information for IboBIU